Aịzaya 29:16
Isaiah 29:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,* ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite. Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị, “Ị kpụghị m”? Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite, “Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?
Isaiah 29:16 in English
Isaiah 29:16 · Berean Standard Bible
You have turned things upside down, as if the potter were regarded as clay. Shall what is formed say to him who formed it, “He did not make me”?* Can the pottery say of the potter, “He has no understanding”?
Context
14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya
jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya,
amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi,
nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.” 15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche
na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,
ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,
“Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!” 16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,*
ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite.
Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị,
“Ị kpụghị m”?
Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite,
“Ị ghọtaghị ihe ọbụla”? 17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,
ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa? 18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,
ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,
hụkwa ụzọ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.