Aịzaya 29:20
Isaiah 29:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,
Isaiah 29:20 in English
Isaiah 29:20 · Berean Standard Bible
For the ruthless will vanish, the mockers will disappear, and all who look for evil will be cut down—
Context
18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,
ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,
hụkwa ụzọ ọzọ. 19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ
nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye. 20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;
ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,
ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,
ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,
ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb,
“Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ.
Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.