Aịzaya 29:10
Isaiah 29:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra. O mechiela anya ndị amụma unu niile, kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.
Isaiah 29:10 in English
Isaiah 29:10 · Berean Standard Bible
For the LORD has poured out on you a spirit of deep sleep. He has shut your eyes, O prophets; He has covered your heads, O seers.
Context
8Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri,
ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta.
Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ,
ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba.
E, otu a ka ọ ga-adị
mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha. 9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.
Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.
Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,
sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya. 10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.
O mechiela anya ndị amụma unu niile,
kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ. 11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.” 12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.