Aịzaya 29:11
Isaiah 29:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”
Isaiah 29:11 in English
Isaiah 29:11 · Berean Standard Bible
And the entire vision will be to you like the words sealed in a scroll. If it is handed to someone to read, he will say, “I cannot, because it is sealed.”
Context
9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.
Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.
Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,
sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya. 10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.
O mechiela anya ndị amụma unu niile,
kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ. 11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.” 12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.” 13Onyenwe anyị sịrị,
“Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,
ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,
ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
Ofufe ha na-efe m, bụ nke
gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.