Aịzaya 29:13
Isaiah 29:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.
Isaiah 29:13 in English
Isaiah 29:13 · Berean Standard Bible
Therefore the Lord said: “These people draw near to Me with their mouths and honor Me with their lips, but their hearts are far from Me. Their worship of Me is but rules taught by men.*
Context
11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.” 12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.” 13Onyenwe anyị sịrị,
“Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,
ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,
ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
Ofufe ha na-efe m, bụ nke
gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha. 14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya
jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya,
amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi,
nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.” 15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche
na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,
ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,
“Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.