Aịzaya 29:9
Isaiah 29:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya. Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ. Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ, sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.
Isaiah 29:9 in English
Isaiah 29:9 · Berean Standard Bible
Stop and be astonished; blind yourselves and be sightless; be drunk, but not with wine; stagger, but not from strong drink.
Context
7Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha,
bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha,
ga-efu dịka nrọ,
onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ. 8Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri,
ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta.
Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ,
ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba.
E, otu a ka ọ ga-adị
mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha. 9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.
Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.
Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,
sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya. 10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.
O mechiela anya ndị amụma unu niile,
kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ. 11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.