Native Bible

Isaiah 29:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.

Isaiah 29:8 in English

Isaiah 29:8 · Berean Standard Bible

as when a hungry man dreams he is eating, then awakens still hungry; as when a thirsty man dreams he is drinking, then awakens faint and parched. So will it be for all the many nations who go to battle against Mount Zion.

Context

6mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha. 7Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha, bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha, ga-efu dịka nrọ, onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ. 8Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha. 9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya. Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ. Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ, sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya. 10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra. O mechiela anya ndị amụma unu niile, kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.