Aịzaya 24:7
Isaiah 24:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
Isaiah 24:7 in English
Isaiah 24:7 · Berean Standard Bible
The new wine dries up, the vine withers. All the merrymakers now groan.
Context
5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya;
ha enupula isi nʼiwu niile,
ha agbanweela ụkpụrụ ya,
mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ. 6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;
ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha.
Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ,
ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ. 7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,
nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude. 8Egwu ụtọ niile akwụsịla,
mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla.
Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa. 9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;
mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.