Aịzaya 24:5
Isaiah 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.
Isaiah 24:5 in English
Isaiah 24:5 · Berean Standard Bible
The earth is defiled by its people; they have transgressed the laws; they have overstepped the decrees and broken the everlasting covenant.
Context
3O nweghị onye ọ ga-ahapụ.
A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya.
Nke a ka Onyenwe anyị kwuru. 4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ.
Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ.
Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya. 5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya;
ha enupula isi nʼiwu niile,
ha agbanweela ụkpụrụ ya,
mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ. 6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;
ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha.
Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ,
ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ. 7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,
nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.