Native Bible

Isaiah 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.

Isaiah 24:6 in English

Isaiah 24:6 · Berean Standard Bible

Therefore a curse has consumed the earth, and its inhabitants must bear the guilt; the earth’s dwellers have been burned, and only a few survive.

Context

4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya. 5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya; ha enupula isi nʼiwu niile, ha agbanweela ụkpụrụ ya, mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ. 6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ. 7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala, nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude. 8Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.