Aịzaya 24:8
Isaiah 24:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egwu ụtọ niile akwụsịla, mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla. Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.
Isaiah 24:8 in English
Isaiah 24:8 · Berean Standard Bible
The joyful tambourines have ceased; the noise of revelers has stopped; the joyful harp is silent.
Context
6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;
ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha.
Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ,
ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ. 7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,
nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude. 8Egwu ụtọ niile akwụsịla,
mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla.
Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa. 9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;
mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya. 10Obodo atọgbọrọla nʼefu;
a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.