Aịzaya 24:10
Isaiah 24:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo atọgbọrọla nʼefu; a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.
Isaiah 24:10 in English
Isaiah 24:10 · Berean Standard Bible
The city of chaos is shattered; every house is closed to entry.
Context
8Egwu ụtọ niile akwụsịla,
mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla.
Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa. 9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;
mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya. 10Obodo atọgbọrọla nʼefu;
a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata. 11Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa.
Ọṅụ adịghịkwa,
otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa. 12Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe,
e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.