Aịzaya 2:12
Isaiah 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala),
Isaiah 2:12 in English
Isaiah 2:12 · Berean Standard Bible
For the Day of the LORD of Hosts will come against all the proud and lofty, against all that is exalted— it will be humbled—
Context
10Gaanụ nʼime nkume,
zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya. 11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.
Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro
nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,
nʼihi na ihe niile e buliri elu
(ka a ga-eweda nʼala), 13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn,*
na osisi ook niile nke Bashan, 14nye ugwu ukwu niile nke dị elu,
na ugwu nta niile e buliri elu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.