Aịzaya 2:10
Isaiah 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
Isaiah 2:10 in English
Isaiah 2:10 · Berean Standard Bible
Go into the rocks and hide in the dust from the terror of the LORD and the splendor of His majesty.
Context
8Ala ha jupụtara nʼarụsị,
ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,
ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ. 9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,
meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.
Ya mere, agbagharala ha. 10Gaanụ nʼime nkume,
zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya. 11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.
Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro
nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,
nʼihi na ihe niile e buliri elu
(ka a ga-eweda nʼala),
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.