Aịzaya 2:11
Isaiah 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
Isaiah 2:11 in English
Isaiah 2:11 · Berean Standard Bible
The proud look of man will be humbled, and the loftiness of men brought low; the LORD alone will be exalted in that day.
Context
9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,
meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.
Ya mere, agbagharala ha. 10Gaanụ nʼime nkume,
zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya. 11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.
Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro
nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,
nʼihi na ihe niile e buliri elu
(ka a ga-eweda nʼala), 13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn,*
na osisi ook niile nke Bashan,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.