Aịzaya 17:11
Isaiah 17:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
Isaiah 17:11 in English
Isaiah 17:11 · Berean Standard Bible
though on the day you plant you make them grow, and on that morning you help your seed sprout— yet the harvest will vanish on the day of disease and incurable pain.
Context
9Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe. 10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.
Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,
maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata, 11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,
nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị. 12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,
nke yiri mkpọtụ oke osimiri.
Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche;
ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri. 13Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,
ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ.
A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka,
na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.