Native Bible

Isaiah 17:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.

Isaiah 17:13 in English

Isaiah 17:13 · Berean Standard Bible

The nations rage like the rush of many waters. He rebukes them, and they flee far away, driven before the wind like chaff on the hills, like tumbleweeds before a gale.

Context

11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị. 12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri. 13Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu. 14Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị, tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa. Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike. E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere. 17:1 Jen 14:15; 15:2; 2Ez 16:9; Jer 49:23; Ems 1:3-5; Zek 9:1; Ọrụ 9:2 17:8 Aịz 2:8; 31:7 17:8 Ashera bụ chi nwanyị ndị Kenan. Ọ bụ osisi ka e ji egosipụta oyiyi ya na ọtụtụ ebe ịchụ aja ya. Nkp 3:7; Dit 12:3; 16:21

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.