Aịzaya 17:12
Isaiah 17:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
Isaiah 17:12 in English
Isaiah 17:12 · Berean Standard Bible
Alas, the tumult of many peoples; they rage like the roaring seas and clamoring nations; they rumble like the crashing of mighty waters.
Context
10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.
Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,
maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata, 11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,
nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị. 12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,
nke yiri mkpọtụ oke osimiri.
Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche;
ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri. 13Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,
ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ.
A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka,
na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu. 14Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị,
tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa.
Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike.
E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.
17:1 Jen 14:15; 15:2; 2Ez 16:9; Jer 49:23; Ems 1:3-5; Zek 9:1; Ọrụ 9:2
17:8 Aịz 2:8; 31:7
17:8 Ashera bụ chi nwanyị ndị Kenan. Ọ bụ osisi ka e ji egosipụta oyiyi ya na ọtụtụ ebe ịchụ aja ya. Nkp 3:7; Dit 12:3; 16:21
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.