Aịzaya 17:9
Isaiah 17:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.
Isaiah 17:9 in English
Isaiah 17:9 · Berean Standard Bible
In that day their strong cities will be like forsaken thickets and summits, abandoned to the Israelites and to utter desolation.
Context
7Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,
nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ. 8Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.
Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.*
Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,*
maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ. 9Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe. 10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.
Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,
maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata, 11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,
nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.