Aịzaya 17:8
Isaiah 17:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka. Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.* Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,* maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.
Isaiah 17:8 in English
Isaiah 17:8 · Berean Standard Bible
They will not look to the altars they have fashioned with their hands or to the Asherahs and incense altars they have made with their fingers.
Context
6Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa,
dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv,
hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu,
maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya. 7Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,
nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ. 8Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.
Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.*
Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,*
maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ. 9Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe. 10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.
Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,
maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.