Native Bible

Isaiah 17:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa, dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv, hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu, maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.

Isaiah 17:6 in English

Isaiah 17:6 · Berean Standard Bible

Yet gleanings will remain, like an olive tree that has been beaten— two or three berries atop the tree, four or five on its fruitful branches,” declares the LORD, the God of Israel.

Context

4“Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala. Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata. 5Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ, na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka nʼime Ndagwurugwu Refaim. 6Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa, dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv, hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu, maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya. 7Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha, nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ. 8Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka. Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.* Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,* maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.