Native Bible

Isaiah 15:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.

Isaiah 15:7 in English

Isaiah 15:7 · Berean Standard Bible

So they carry their wealth and belongings over the Brook of the Willows.*

Context

5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,* ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit.* Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha. 6Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ. 7Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile. 8Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile; akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim; abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim. 9Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara, ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn! Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab* gbapụrụ tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ. 15:1 Obodo Ar na Kia, bụ obodo abụọ dị mkpa nʼala ndị Moab. 15:5 Aịz 16:11; Jer 48:31 15:5 Jer 48:5 15:9 2Ez 17:25; Jer 50:17

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.