Native Bible

Isaiah 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,* ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit.* Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.

Isaiah 15:5 in English

Isaiah 15:5 · Berean Standard Bible

My heart cries out over Moab; her fugitives flee as far as Zoar, as far as Eglath-shelishiyah.* With weeping they ascend the slope of Luhith; they lament their destruction on the road to Horonaim.

Context

3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala. 4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji. 5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,* ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit.* Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha. 6Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ. 7Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.