Native Bible

Isaiah 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.

Isaiah 15:4 in English

Isaiah 15:4 · Berean Standard Bible

Heshbon and Elealeh cry out; their voices are heard as far as Jahaz. Therefore the soldiers of Moab cry out; their souls tremble within.

Context

2Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara. 3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala. 4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji. 5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,* ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit.* Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha. 6Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.