Native Bible

Isaiah 15:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.

Isaiah 15:2 in English

Isaiah 15:2 · Berean Standard Bible

Dibon goes up to its temple to weep at its high places. Moab wails over Nebo, as well as over Medeba. Every head is shaved, every beard is cut off.

Context

1Amụma megide Moab: Ar dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị. Kia dị na Moab a laala nʼiyi, a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.* 2Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara. 3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala. 4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.