Aịzaya 15:3
Isaiah 15:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi, mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama. Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa na-ada nʼala.
Isaiah 15:3 in English
Isaiah 15:3 · Berean Standard Bible
In its streets they wear sackcloth; on the rooftops and in the public squares they all wail, falling down weeping.
Context
1Amụma megide Moab:
Ar dị na Moab a laala nʼiyi,
a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.
Kia dị na Moab a laala nʼiyi,
a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.* 2Ndị niile bi na Dibọn
na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị
Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba.
Isi ha niile bụ isi nkwọcha,
afụọnụ ha niile ka akpụchakwara. 3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi,
mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama.
Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwa
na-ada nʼala. 4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa,
a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz.
Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa,
mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji. 5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,*
ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa
na Eglat Shelishiya.
Ha na-akwa akwa
dịka ha na-arịgo Luhit.*
Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim,
ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.