Aịzaya 14:26
Isaiah 14:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
Isaiah 14:26 in English
Isaiah 14:26 · Berean Standard Bible
This is the plan devised for the whole earth, and this is the hand stretched out over all the nations.
Context
24Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị,
“Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa.
Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya. 25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m,
nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ.
A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m,
a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.” 26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile;
nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche. 27Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya?
O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ? 28Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.