Aịzaya 14:24
Isaiah 14:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
Isaiah 14:24 in English
Isaiah 14:24 · Berean Standard Bible
The LORD of Hosts has sworn: “Surely, as I have planned, so will it be; as I have purposed, so will it stand.
Context
22Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị,
“Aga m ebili megide ha;
aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ,
na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha.
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 23Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị,
na ebe mmiri ga na-adọkọ.
M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 24Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị,
“Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa.
Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya. 25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m,
nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ.
A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m,
a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.” 26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile;
nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.