Aịzaya 14:23
Isaiah 14:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
Isaiah 14:23 in English
Isaiah 14:23 · Berean Standard Bible
“I will make her a place for owls and for swamplands; I will sweep her away with the broom of destruction,” declares the LORD of Hosts.
Context
21Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom,
nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha.
Ha agaghị ebili nweta ala ahụ,
mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile. 22Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị,
“Aga m ebili megide ha;
aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ,
na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha.
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 23Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị,
na ebe mmiri ga na-adọkọ.
M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. 24Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị,
“Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa.
Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya. 25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m,
nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ.
A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m,
a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.