Aịzaya 14:27
Isaiah 14:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?
Isaiah 14:27 in English
Isaiah 14:27 · Berean Standard Bible
The LORD of Hosts has purposed, and who can thwart Him? His hand is outstretched, so who can turn it back?
Context
25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m,
nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ.
A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m,
a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.” 26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile;
nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche. 27Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya?
O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ? 28Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ: 29Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia,
maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela;
Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala,
mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.