Aịzaya 13:6
Isaiah 13:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,* ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.
Isaiah 13:6 in English
Isaiah 13:6 · Berean Standard Bible
Wail, for the Day of the LORD is near; it will come as destruction from the Almighty.*
Context
4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;
gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.
Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.
Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha. 5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya
na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa.
Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị
na-abịa imebi ala ahụ niile. 6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,*
ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. 7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. 8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha
mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.
Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.
Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.