Aịzaya 13:8
Isaiah 13:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.
Isaiah 13:8 in English
Isaiah 13:8 · Berean Standard Bible
Terror, pain, and anguish will seize them; they will writhe like a woman in labor. They will look at one another, their faces flushed with fear.
Context
6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,*
ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. 7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. 8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha
mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.
Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.
Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. 9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.
A ga-ekpochapụ ala ahụ,
ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. 10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
agaghị egosipụta ìhè ha.
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.