Aịzaya 13:9
Isaiah 13:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.
Isaiah 13:9 in English
Isaiah 13:9 · Berean Standard Bible
Behold, the Day of the LORD is coming— cruel, with fury and burning anger— to make the earth a desolation and to destroy the sinners within it.
Context
7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,
obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. 8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha
mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.
Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.
Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. 9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.
A ga-ekpochapụ ala ahụ,
ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. 10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
agaghị egosipụta ìhè ha.
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,
ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.