Aịzaya 13:11
Isaiah 13:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
Isaiah 13:11 in English
Isaiah 13:11 · Berean Standard Bible
I will punish the world for its evil and the wicked for their iniquity. I will end the haughtiness of the arrogant and lay low the pride of the ruthless.
Context
9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.
A ga-ekpochapụ ala ahụ,
ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. 10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
agaghị egosipụta ìhè ha.
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,
ya na nganga onye na-adịghị eme ebere. 12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa. 13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,*
nʼihi oke iwe* ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.