Aịzaya 13:13
Isaiah 13:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,* nʼihi oke iwe* ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
Isaiah 13:13 in English
Isaiah 13:13 · Berean Standard Bible
Therefore I will make the heavens tremble, and the earth will be shaken from its place at the wrath of the LORD of Hosts on the day of His burning anger.
Context
11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,
ya na nganga onye na-adịghị eme ebere. 12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa. 13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,*
nʼihi oke iwe* ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ. 14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha
dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,
maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha. 15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.