Aịzaya 13:15
Isaiah 13:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ, onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.
Isaiah 13:15 in English
Isaiah 13:15 · Berean Standard Bible
Whoever is caught will be stabbed, and whoever is captured will die by the sword.
Context
13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,
meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,*
nʼihi oke iwe* ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ. 14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha
dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,
maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha. 15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo. 16A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha. 17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
ọ dịkwaghị ọlaedo
maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.