Aịzaya 13:17
Isaiah 13:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha; ọ dịkwaghị ọlaedo maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.
Isaiah 13:17 in English
Isaiah 13:17 · Berean Standard Bible
Behold, I will stir up against them the Medes, who have no regard for silver and no desire for gold.
Context
15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo. 16A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha. 17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
ọ dịkwaghị ọlaedo
maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya. 18Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,
maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere. 19Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,
ịma mma na ebube ndị Kaldịa,
mgbe Chineke ga-akwatu ya
ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.