Aịzaya 13:16
Isaiah 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha; a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.
Isaiah 13:16 in English
Isaiah 13:16 · Berean Standard Bible
Their infants will be dashed to pieces before their eyes, their houses will be looted, and their wives will be ravished.
Context
14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.
Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha
dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,
maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha. 15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,
onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo. 16A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;
a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha. 17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
ọ dịkwaghị ọlaedo
maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya. 18Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,
maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.