Aịzaya 13:19
Isaiah 13:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile, ịma mma na ebube ndị Kaldịa, mgbe Chineke ga-akwatu ya ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.
Isaiah 13:19 in English
Isaiah 13:19 · Berean Standard Bible
And Babylon, the jewel of the kingdoms, the glory of the pride of the Chaldeans, will be overthrown by God like Sodom and Gomorrah.
Context
17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;
ọ dịkwaghị ọlaedo
maọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya. 18Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;
ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,
maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere. 19Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,
ịma mma na ebube ndị Kaldịa,
mgbe Chineke ga-akwatu ya
ọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra. 20Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.
Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;
ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ. 21Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.
Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,
na ikwighịkwighị,
nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.