Aịzaya 13:10
Isaiah 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya.
Isaiah 13:10 in English
Isaiah 13:10 · Berean Standard Bible
For the stars of heaven and their constellations will not give their light. The rising sun will be darkened, and the moon will not give its light.
Context
8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.
Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha
mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.
Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.
Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. 9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,
ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.
A ga-ekpochapụ ala ahụ,
ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. 10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu
agaghị egosipụta ìhè ha.
Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya
ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,
taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.
Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,
ya na nganga onye na-adịghị eme ebere. 12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,
ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.