Native Bible

Isaiah 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile.

Isaiah 13:5 in English

Isaiah 13:5 · Berean Standard Bible

They are coming from faraway lands, from the ends of the heavens— the LORD and the weapons of His wrath— to destroy the whole country.

Context

3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m. 4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha. 5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile. 6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,* ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. 7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.