Aịzaya 11:13
Isaiah 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị*; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
Isaiah 11:13 in English
Isaiah 11:13 · Berean Standard Bible
Then the jealousy of Ephraim * will depart, and the adversaries * of Judah will be cut off. Ephraim will no longer envy Judah, nor will Judah harass Ephraim.
Context
11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ* inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,* sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. 12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ
ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,
ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa
kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha. 13Ekworo Ifrem ga-akwụsị,
a ga-ebipụ ndị iro Juda.
Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị*;
ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ. 14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;
ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.
Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.
Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi. 15Onyenwe anyị ga-eme
ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.
Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ
mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.
Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,
nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.