Native Bible

Isaiah 11:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ* inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,* sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.

Isaiah 11:11 in English

Isaiah 11:11 · Berean Standard Bible

On that day the Lord will extend His hand a second time to recover the remnant of His people from Assyria, from Egypt, from Pathros, from Cush,* from Elam, from Shinar,* from Hamath, and from the islands * of the sea.

Context

9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ* inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,* sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. 12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha. 13Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị*; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.