Native Bible

Isaiah 11:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.

Isaiah 11:12 in English

Isaiah 11:12 · Berean Standard Bible

He will raise a banner for the nations and gather the exiles of Israel; He will collect the scattered of Judah from the four corners of the earth.

Context

10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ* inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,* sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. 12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha. 13Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị*; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ. 14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.