Aịzaya 11:14
Isaiah 11:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
Isaiah 11:14 in English
Isaiah 11:14 · Berean Standard Bible
They will swoop down on the slopes of the Philistines to the west; together they will plunder the sons of the east. They will lay their hands on Edom and Moab, and the Ammonites will be subject to them.
Context
12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ
ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,
ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa
kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha. 13Ekworo Ifrem ga-akwụsị,
a ga-ebipụ ndị iro Juda.
Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị*;
ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ. 14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;
ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.
Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.
Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi. 15Onyenwe anyị ga-eme
ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.
Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ
mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.
Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,
nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee. 16Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ
nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ,
dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga,
mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.
11:11 Okwu a, “nke ugboro abụọ,” na-egosi na onwe mgbe ha lọtara nʼoge gara aga. Nlọghachi mbụ ha, bụ oge ha si Ijipt lọta.
11:11 Maọbụ, Patros
11:13 Aịz 9:21; Jer 3:18; Izk 37:16,17,22
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.