Aịzaya 11:15
Isaiah 11:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
Isaiah 11:15 in English
Isaiah 11:15 · Berean Standard Bible
The LORD will devote to destruction * the gulf * of the Sea of Egypt; with a scorching wind He will sweep His hand over the Euphrates.* He will split it into seven streams for men to cross with dry sandals.
Context
13Ekworo Ifrem ga-akwụsị,
a ga-ebipụ ndị iro Juda.
Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị*;
ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ. 14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha;
ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha.
Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab.
Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi. 15Onyenwe anyị ga-eme
ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa.
Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ
mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis.
Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa,
nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee. 16Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ
nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ,
dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga,
mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.
11:11 Okwu a, “nke ugboro abụọ,” na-egosi na onwe mgbe ha lọtara nʼoge gara aga. Nlọghachi mbụ ha, bụ oge ha si Ijipt lọta.
11:11 Maọbụ, Patros
11:13 Aịz 9:21; Jer 3:18; Izk 37:16,17,22
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.