Aịzaya 11:10
Isaiah 11:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
Isaiah 11:10 in English
Isaiah 11:10 · Berean Standard Bible
On that day the Root of Jesse will stand as a banner for the peoples. The nations will seek Him,* and His place of rest will be glorious.
Context
8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;
nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,
nʼelu ugwu nsọ m niile.
Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma
nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ* inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt,* sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. 12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ
ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ,
ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa
kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.