Aịzaya 11:8
Isaiah 11:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
Isaiah 11:8 in English
Isaiah 11:8 · Berean Standard Bible
The infant will play by the cobra’s den, and the toddler will reach into the viper’s nest.
Context
6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;
agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa,
ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha. 7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,
ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe.
Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi. 8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;
nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,
nʼelu ugwu nsọ m niile.
Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma
nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.