Aịzaya 11:7
Isaiah 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
Isaiah 11:7 in English
Isaiah 11:7 · Berean Standard Bible
The cow will graze with the bear, their young will lie down together, and the lion will eat straw like the ox.
Context
5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume,
ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya. 6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo;
agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa,
ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha. 7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe,
ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe.
Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi. 8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala;
nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe,
nʼelu ugwu nsọ m niile.
Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma
nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.