Hosiya 9:5
Hosea 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?
Hosea 9:5 in English
Hosea 9:5 · Berean Standard Bible
What will you do on the appointed day, on the day of the LORD’s feast?
Context
3Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị,
ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt
nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ. 4Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị,
nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ.
Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị.
Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha,
ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka,
ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị? 6A sịkwa na ha agbanarị mbibi,
ndị Ijipt ga-achịkọta ha.
Ndị Memfis ga-elikwa ha.
Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ,
ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile, 7Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* na-abịa,
Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso.
Ka Izrel mara nke a.
Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu,
nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala,
unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu,
na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.